Ebumnuche


CHETAKWA NA ỤGBỌ APỤGHỊ N’OGE EKWESỊGHỊ IMEBI N’ỤZỌ, IGBO GA-ADỊ.
Ebumnuche Igbogaadị bụ dịka aha ya siri dị, ka Igbo ghara ịda mmiri ma dịkwara anyị ọkpụtọrọkpụ. Ọ bụ maka iso kwalite asụsụ ọma na omenala Igbo ka e jiri mụpụta ya. Igbogaadị bụ ebe anyị ga na-atụgharị uche n’ụdị dị iche iche site na-ịkparịta ụka, ya na itulegasị mkpụrụokwu Igbo. Sitekwa na-ịjikọ aka ọnụ wee na-atule ha ka anyị ga-eji nye aka iso chọtagasị mkpụrụokwu ndị ahụ anyị chere na ha furu efu ma ọ bụ ịmụpụta na ịchọpụtakwa ndị ọhụrụ maka na ọ bụ chi na-efo, ọkụkọ a na-enwe dị.

O sokwa bụrụ ebumnuche Igbogaadị ka ndezu asụsụ Igbo ghara ị bụ ihe otu onye n’ihi na ọ bụ a nyụkọọ amịrị ọnụ ọ gbụọ ụfụfụ. Ọ bụrụ na anyị kwekọrịta site na ntụgharị uche na ụka anyị kpara ebe a, anyị ga na-eziru ndị Òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo [bekee]Society for Promoting Igbo Language and Culture, ya na Òtù Nhazi Asụsụ Igbo [bekee]Igbo Standardization Committee ozi, sị ha lekwa ihe Igbogaadị chere. Ha tulee ya, ọ bụrụ na ọ bụ ihe bara uru ma ọ bụ ihe dị ḿmā, ha ga-etinye ya dịka mkpụrụokwu Igbo ọhụrụ. Asụsụ Igbo Kwesịrị iso asụsụ ndị mba ọzọ na-eto, sorokwa na-amụta ụmụ dịka asụsụ ụwa.

Igbogaadị bụ ebe anyị ga na-atule ihe gbasara Igbo n’ụdị dị iche iche dịka ịmụta ilu, akpalaokwu, akụkọ ifo wdg., ya na isi na ntụgharị uche mụtakwa Igbo n’ụdị pụrụ iche. Mbọ kachasị anyị na-agba bụ ịhụ na anyị ejighị olundị (olumba) wee na-edepụta ihe niile dị ebe a, ya mere anyị ji agbalị òtù anyị nwere ike were Igbo Izugbe na-atapịa akwụ-ozi anyị. Anyị gbadoro ụkwụ na ‘Sụwakwa Igbo’ maka na ọ ga-abụ ihe ziri ezi ka ọ bụ ma onye Igbo ọ bụla na-asụ Igbo dịka o siri masị ya (olundị) ma were ótù olu na-ede ya ede (Igbo-Izugbe). Ọ bụrụ na anyị akpọghị Igbo mkpa, soro márá na Igbo bụ asụsụ anyị, ma jikọọ aka ọnụ wee kwalite ya, kedụ ka ala Igbo ga-esi bụ otu? Igbogaadị ga na-egosịpụta ebumnuche ndị Igbo niile uche ha dị na-iso hazie ma kwadokwa asụsụ Igbo. Zitere anyị ihe ị chọrọ ka anyị kpaa maka ya, anyị ga-emekwa ka ọ bụrụ okwu ọha.

Maka imezu ebumnuche nke a ka Igbogaadị jiri mebere ndị Igbo ihe e ji akụpụta mkpụrụedemede Igbo na kọmputa aha ya bụ VIRTUAL IGBO. Onye na-ede Igbo ma ndaume mfe dịka ị, ọ, ụ adịghị na ya, nke ụdaelu Ó, ụdaala Ò maọbụ ụdansụda Ō maka iji kọwaa aha ji adịya, mara na onye ahụ ebidobeghị ide asụsụ Igbo maka na a nyụchaa nsị akapịbaghị ya ọnụ, ọ bụrụ otoro. VIRTUAL IGBO mere ka ịkụpụta mkpụrụedemede Igbo na kọmputa dị oke m̀fé ma dịkwa ụtọ. Ị ga-ejikwa ya kụpụta mkprụedemede ñ, ya na ₦. Butue ya na kọmputa gị, i nwere abalị ise iji tulee ya tupu i goro akara-ikike nke gị, ọ dị ezigbo ọnụ ala. Egwu atụla gị n’ihi na a naghị eresị onye ụlọ ọkụkọ ọkpa jiri. Igbogaadị ji n’aka na Virtual Igbo ga-eme gị obi ụtọ.

Onye nụ ya biko kọọrọ ibe ya maka na ihe ahụ di woro ogori azụọla n’ahịa! VIRTUAL IGBO!!

Soro Igbogaadị kwalite asụsụ Igbo n’ihi na bekee abụghị nke anyị, maka na onye nñụñụ ọgọdọ anaghị agbasi egwu íké. Nke anyị bụ nke anyị, ma nke m bụ nke m.
Ana m ekwu na Igbo ga-adị!

igbogaadi