Ekele 2013

Jan 5, 2013 si n'aka


Igbogaadị n’ekele Chineke maka ndụ, ahụ ike, ọganihu, udo, ịdịnotu, wdg. nke o nyere anyị niile n’afọ a gara aga. Anyị ma na Chineke anyị n’efe hụrụ anyị n’anya dịka o mere ka anyị mara n’akwụkwọ Jeremaya 29:11; “N’ihi na m maara nke ọma ihe m na-echere unu,” ka Chineke kwuru, “ọ bụ echiche ọganihu ọ bụghị nke ọdachi, ya na inye unu ọdịnihu na olileanya [bekee]Jeremiah 29:11; For I know the plans I have for you, says the Lord, plans for welfare and not for evil, to give you a future and a hope. RSV..” Anyị na-asị ya ndewo maka iji echiche ọma nabata anyị n’afọ 2013.

Emume afọ ọhụrụ abụghị sọnsọ maka oriri na ọñụñụ, kama ọ bụ ụbọchị anyị kwesịrị ibunye Chineke anyị ụ̀kpá ekele n’ihi na obiọma ya na-adị mgbe ebighị ebi. Akwụkwọ Abụ ọma 100:4; “Werenụ ekele baa n’ọnụ ụzọ ámá ya niile, werenụ otuto baa n’ogige ya niile. Keleenụ ya, gọzikwanụ aha ya [bekee]Psalm 100:4; Enter his gates with thanksgiving, and his courts with praise. Give thanks to him, bless his name. RSV..”

Emume afọ ọhụrụ bụụrụ anyị nnukwu ụbọchị dịka isimbido ụbọchị n’afọ maka na ọ bụ a gụghee ụzọ, a gụghee ọnụ. N’oge a ka anyị ji elekwa onwe anyị ọrụ maka ḿbọ̀ niile anyị gbakọbara n’afọ gara aga n’ihi na ọ na-adị ḿmā akpata n’anwụ ka e rie ya na ǹdò maka na oriri abụghị ọnụ nkahie.

Igbogaadị wee were ohere a na-arịọ ndị Igbo niile ka ha were udo, ịhụnanya, eziokwu, ịdịnotu were bido afọ a maka ọdịmma Igbo niile. Onye hụrụ ezigbo ihe ga-abara nwanne ya uru, ya biko kwado ya maka na anyị nyụkọ amịrị ọnụ ọ gbụọ ụfụfụ, IGWEBUIKE! Ama m na ndị Igbo niile bụ ótù echiche ka ha na-echebara ala Igbo, kama onye ọ bụla si ụ́zọ̀ dị iche iche achụje nke ya. Anyị chụwa ya nke onye gbata ya gbaghaa ibe ya, maranụ na o nweghị ebe anyị ga-eru n’ihe gbasara ọganihu ndị Igbo. Ka anyị si n’aka agbụrụ ndị ọzọ wee mụta iji ótù obi achụ ọganihu na ọdịmma ala Igbo n’ihi na ọ bụ e were áká nye áká, o too ogologo.
Ọ dịrị nwoke ḿmā, ya dịkwara nwanyị ḿmā, nke m akọla m jiri bụrụ aha.
Ana m ekwu na Igbo ga-adị!

Nkàtá yirinu

Oyiri

Soro gbasaa ozi

Hapụ Ozi