Mbido Ọnụigbo


Anyị na-agba ḿbọ̀ ịhụ n’ihe niile anyị depụtara ebe a gbadoro ụkwụ na nkuzi ọgbraọhụrụ dịka nke ndị Òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo (Society for Promoting Igbo Language and Culture) debere a na-akpọ ọtọrọfịị Ọnwụ ma ọ bụ mkpụrụedemede Ọnwụ [bekee]The wide variety of spoken dialects has made agreeing on a standardized orthography and dialect of Igbo difficult. The current Ọnwụ alphabet, a compromise between the older Lepsius alphabet and a newer alphabet advocated by the International Institute of African Languages and Cultures (IIALC), was agreed to in 1962. -Wikipedia. Anyị na-esokwa usoro ndị òtù Nhazi Asụsụ Igbo (Igbo Standardization Committee) n’azụ bụ ndị na-ahụ maka mkpụrụokwu na-agbasa anya n’asụsụ Igbo. Soro kwalite ọganihu asụsụ Igbo site na-iso jiri Igbo Izugbe (central) na-ede Igbo ma hapụ iji Olumba/Olundị maka na asụsụ Igbo bara ụba [bekee]According to Ethnologue, Igbo dialects include: Owerri (Isuama), Ọnicha (Onitsha), Ụmụahịa, Ọlụ (Orlu), Ngwa, Afịkpo, Nsa, Ugwuta (Oguta), Anịocha, Eche, Egbema, Ọka (Awka), Bonny-Opobo, Mbaise, Nsụka, Ọhụhụ, Ụnwana. 30 dialects vary in inherent intelligibility. The standard literary form is developing based on the dialects of Owere (Owerri) and Umuahia, omitting the nasality and aspiration found in those dialects. Also according to Ethnologue, Izi (Izzi), Ezaa (Eza), Ikwo, and Mgbo (Ngbo) constitute an additional dialect cluster. -Igbo-PanAfril 10n (African localisation wiki) . Ọ bụrụ na anyị nọrọ na-azọ onye ọ ga-abụ olu ya ka a ga-eji de Igbo mara na anyị agaghị eru ebe ọ bụla. Ótù osisi anaghị eme ọhịa mere gidigidi jiri bụrụ ugwu eze. Soro were VIRTUAL IGBO debe Igbo n’ihi na a nyụchaa nsị ma akapịbaghị ya ọnụ, ọ bụrụ otoro.
Ka anyị kwanyere asụsụ Igbo ugwu ruuru ya, maka na ọ bụ ikwu amaghị ibe ezi ya.

Mkpụrụedemede Abịdịị ọgbaraọhụrụ na agbaochie

  • Abịdịị ọgbaraọhụrụ (mkpụrụedemede Ọnwụ)

» Nnukwu mkpụrụedemede ọgbaraọhụrụ «

A, B, CH, D, E, F, G, GB, GH, GW, H, I, Ị,

J, K, KP, L, M, N, Ñ, NW, NY, O, Ọ, P, R,

S, SH, T, U, Ụ, V, W, Y, Z

» Obere mkpụrụedememde ọgbaraọhụrụ «

a, b, ch, d, e, f, g, gb, gh, gw, h, i, ị, j, k,

kp, l, m, n, ñ, nw, ny, o, ọ, p, r, s, sh, t, u,

ụ, v, w, y, z


  • Abịdịị agbaochie (nke e jiburu *a b gb d wee mara)

» Nnukwu mkpụrụedemede agbaochie«

A, B, GB, D, E, F, G, GH, H, I, Ị, J, K, L,

M, N, Ñ, O, Ọ, P, KP, R, S, SH, T, U, Ụ,

V, W, Y, Z, CH, GW, KW, NW, NY

» Obere mkpụrụedememde agbaochie«

a, b, gb, d, e, f, g, gh, h, i, ị, j, k, l, m, n,

ñ, o, ọ, p, kp, r, s, sh, t, u, ụ, v, w, y, z,

ch, gw, kw, nw, ny


Ọ bụ ndị Òtù Iwelite Asụsụ na Omenala Igbo (Society for Promoting Igbo Language and Culture) nke onye isi ha mgbe ahụ bụ Mazị Ọnwụ jikọtara áká ọnụ wee wepụta mkpụrụedemede ọgbaraọhụrụ a n’afọ 1962. Òtù a bụ n’afọ 1949 ka e guzobere ya maka ọdịmma na ịkwalite asụsụ na omenala Igbo. Ọ bụkwanụ ndị òtù a mere na ndọrọndọrọ ahụ dịbu n’etiti ndị ụka gbasara ụdị mkpụrụedemede e ji ede Igbo jiri kwụsị. Mgbe ahụ ásá na àjà bụ ázụ̀, ụfọdụ ndị ji olu Owere, ụfọdụ were olu Ọnịcha na-ede Igbo. Taata, ihe dị iche adịla, ndị Igbo ewerela otu olu na-ede Igbo maka na ihe ọ bụla e megburu mma, bụ nwamma ka a na-akpọ ya !

Ọnụọgụgụ ọgbaraọhụrụ na agbaochie

  • Ọnụọgụgụ ọgbaraọhụrụ

0…………Éfù

1…………Otu

2…………Abụọ

3…………Atọ

4…………Anọ

5…………Ise

6…………Isii

7…………Asaa

8…………Asatọ

9…………Itoolu

10………..Iri

20………..Iri abụọ

67………..iri isii na asaa

dgz.

100……………narị

194……………narị na iri itoolu na anọ

555……………narị ise, iri ise na ise

1,000………….puku

1,350………….otu puku, narị atọ na iri ise

10,000…………puku iri

18,330…………puku iri na asatọ, narị atọ na iri atọ

100,000………..puku narị

1,000,000………nde

10,000,000……..nde iri

100,000,000…….nde narị

1,000,000,000…..ijeri

10,000,000,000….ijeri Iri

dgz.


  • Ọnụọgụgụ agbaochie na olumba / olundị

0………..Nkịtị

1………..ofu

2………..ibụọ

3………..ịtọ

4………..ịnọ

7………..ịsaa

8………..ịsatọ

9………..itenaịnị/teghete

13……….iri na ịtọ

20……….ọgụ/ohu

40……….ọgụ na abọ

50……….ọgụ na abọ na iri

100……….ọgụ ise

200……….ọgụ iri

250……….ọgụ iri na ịbụọ na iri / bere ọgụ na abọ na iri n’ọgụ iri na ise

300……….ọgụ iri na ise

360……….ọgụ iri na ịsatọ / bere ọgụ na abọ na nnụ

400……….nnụ

800……….nnụ naabọ

1,000……..nnụ naabọ na ọgụ iri

5,0000…….bere ọgụ iri na nnụ iri na ịtọ

160,000……nnụ kwuru nnụ

160,290……nnụ kwuru nnụ na ọgụ na ịsaa na iri

dgz.


N’oge ochie ọ bụrụ na a gụkata ọnụọgụ ma amaghịzi ka a ga-esi gụrụ gawa, ọ ghọrọ a gụkata agba awaa. Ọ bụ mgbe ọ nyịrị onye na-agbakọ ka ọ ga-asị na ihe ọ na-agbakọ bụzị a gụkata agba awaa. Ọ pụtaghị na onye ọzọ kara mara agụ ọnụọgụ ga-akwụsị ebe ahụ. Ọ bụrụ na i lee anya ị ga-ahụ na mgbakọ na mwepụ dị n’ọnụọgụ agbaochie bara ụba nke úkwú, o mekwara ịgbakọ ihe o sie ezigbo ike.

Elekere maọbụ Kụlọọkụ

» Aka elekere n’olu Igbo «

Aka ntabianya…second hand

Aka nkeji……….minute hand

Aka awa………..Hour hand

E jikwa aka mkpụmkpụ wee mara aka nkeji, werekwa aka ogologo mara aka awa mgbe ochie.

» Ịmụta oge n’elekere «

Ọ bụrụ na aka ntabianya kụzuo iri atọ, e nweta ọkara nkeji

Ọ bụrụ na aka ntabianya kụzuo iri isii, e nweta otu nkeji

Ọ bụrụ na aka nkeji kụzuo iri atọ, e nweta ọkara awa

Ọ bụrụ na aka nkeji kụzuo iri isii, e nweta otu awa

Ọ bụrụ na aka awa kụzuo iri na abụọ, e nweta ọkara ụbọchị

Ọ bụrụ na aka awa kụzuo iri abụọ na anọ, e nweta otu ụbọchị

Ọ bụrụ na aka awa kụzuo iri anọ na abụọ, e nweta mkpụrụ ụbọchị abụọ


» Nkọwa A.M na P.M «

Ọ bụrụ na aka awa kụzuo iri abụọ na anọ, e nweta otu ụbọchị. E kewara awa iri abụọ na anọ ahụ ụzọ abụọ nke otu ụzọ n’ime ya bụ awa iri na abụọ. Awa iri na abụọ nke izizi bụ a.m, awa iri na abụọ nke ọzọ bụrụ p.m. E ji a.m na p.m akọwa ọge n’ụbọchị dịka abalị, ehihie, mgbede na ụtụtụ.

A.M [bekee]a.m. from the Latin ante meridiem, meaning before midday. Wikipedia pụtara tupu etiti ehihie n’olu bekee, nke na-ebido na etiti abalị kwụsị ma ọ fọdụ otu nkeji tupu etiti ehihie. A na-agbakwunye ‘nke ụtụtụ’ na ‘ụ̀zọ́ ụtụtụ’ n’elekere ọ bụla danyere n’oge a.m n’olu beke, ịmmatụ, 10 a.m pụtara elekere iri nke ụtụtụ, 4.30 a.m pụtara ọkara gafee elekere isii na ụ̀zọ́ ụtụtụ (nkeji iri atọ gafee elekere isii na ụ̀zọ́ ụtụtụ), 10.57 a.m pụtara na ọ fọdụrụ nkeji atọ ka ọ kụọ elekere iri na otu nke ụtụtụ. Ndị Igbo na-agbakwa ụ̀zọ́. Okeọkpa izizi kwaa mgbe ahụ chi efobeghị ka a na-akpọ ụ̀zọ́ ụtụtụ.

P.M [bekee] p.m. from the Latin post meridiem, meaning before midday. Wikipedia bụ ma a gafee etiti ehihie nke na-ebido ma elekere iri abụọ kụọ n’ehihie. p.m na-ebido n’etiti ehihie kwụsị ma ọ fọdụ otu nkeji tupu etiti abalị. N’ala Igbo anyị nwere ehihie, mgbede na abalị, ha nile so na nke ndị bekee kpọrọ p.m. Elekere ọ bụla danyere n’oge dị otu a ga-ebu ‘nke ehihie’, ‘nke mgbede’ ma ọ bụ ‘nke abalị’ n’isi ngwụcha ya. Immatụ, 2 p.m pụtara elekere abụọ nke ehihie, 5 p.m pụtara elekere ise nke mgbede, 9.32 p.m pụtara na ọ fọdụrụ nkeji iri abụọ na asatọ ka ọ kụọ elekere iri nke abalị. Ndị Igbo ka sikwa otu ha si agụ oge mgbe ochie ama mgbe bụ ehihie, mgbede ma ọ bụ abalị. Ọ bụrụ na anyanwụ kwụrụ n’elu oge elekere gafeerela elekere iri na abụọ nke ehihie, ị mara na ọ bụ ehihie. Anyanwụ gbadaa na-achọ ọdịda, ị mara na ọ bụ mgbede. Ọ bụrụ na anyanwụ daruo ala, ọkụkọ lakpuo ụra, ị mara na ọ bụrụla abalị.

N’ezie ọ pụtaghị na tupu ndị bekee ewetere anyị elekere na ndị Igbo enweghị ihe ha ji agụ oge, ha na-eji onyinyo, anyanwụ na ịkwa ákwá okeọkpa were ama oge. O nweghị usoro kpomkwem e si amata ma p.m ọ bụ ehihie, mgbede ma ọ bụ abalị karịa iji anyanwụ, onyinyo na elekere. Ndị Igbo na-eji anyanwụ, onyinyo na ịkwa ákwá okeọkpa ama oge n’ụbọchị ma sikwa otu ahụ kewaara ya a.m na p.m.

Igụafọ ndị Igbo

Tupu bekee abịa, ndị igbo nwere ka ha si agụ afọ. Ọ dị ezigbo mkpa ị ma na agụmagụ ụbọchi ndị Igbo nwere sokwa n’agụmagụ afọ dị n’ụwa bụ kpọmkwem. Tupu ndị ụka abịa, ndị Igbo n’agụ izu. Ka ndị ụka bịara ala Igbo ka ha wetaara anyị nke a kpọrọ izuụka pụtara izu nke ndị ụka. Izuụka bụ ka ụwa nile si agụ afọ taata.

» Ka ndị Igbo si agụ afọ «

  • Izu ochie

Abalị anọ na-emebe otu izu (Eke, Orie, Afọ na Nkwọ). Nke a bụ aha ahịa ndị Igbo.

Izu asaa na-emebe otu ọnwa (abalị iri abụọ na asatọ)

Ọnwa iri na atọ na-emebe otu afọ (abalị narị atọ, iri isii na anọ)

Ọnwa izizi ndị Igbo na-ebidokarị n’ọnwa izizi na apụta na febụwarị.

  • Izu ndị ụka (Izuụka)

Abalị asaa na-emebe otu izuụka (Mọndee, Tuuzdee, Wenezdee, Tọọzdee, Fraịdee, Satọdee na Sọndee)

Izuụka anọ na ụma na-emebe otu ọnwa (abalị iri atọ ma ọ bụ iri atọ na otu)

Ọnwa iri na abụọ na-emebe otu afọ (abalị narị atọ, iri isii na ise)

Ọnwa izizi bụ Jenụwarị dịka anyị siri mara.