Ncheta olundị n’ụwa niile

Feb 21, 2013 si n'aka


Taata bụ ụbọchị ndị òtù UNESCO wepụtara maka ncheta na nkwado asụsụ na ọdịnaala agbụrụ dị iche iche n’ụwa gbaa gburugburu nke ha kpọrọ ncheta olundị n’ụwa niile [bekee]International Mother Language Day is an observance held annually on 21 February worldwide to promote awareness of linguistic and cultural diversity and multilingualism. Wikipedia. Dịka e siri nwe ọtụtụ mba na obodo dị iche iche ka e sikwara nwe ụdịrị asụsụ na ọdịnaala dị iche iche n’ụwa. Mmemme nke a bụ maka ime ka asụsụ agbụrụ ọ bụla dị ndụ, ya na iji kwalite odịnaala agbụrụ niile. Ncheta olundị n’ụwa niile na-adị kwa afọ ọ bụla ụbọchị iri abụọ na ótù n’ọnwa febụwarị (21 February). Ọ bụ kamgbe afọ puku abụọ (2000) ka e bidoro chetawa olundị, mana òtù UNESCO wubere emume a kpọmkwem n’afọ puku abụọ na asatọ (2008).
Igbogaadị ghọtara na ihe e jiri dewe ya bụ ụbọchị maka ncheta olundị bụ n’ihi na ọ bụ ụbọchị ndị uwe ojii gbagburu ụfọdụ ụmụakwụkwọ na-eme ngagharị-iwe na obodo ha bụ dhaka, n’afọ iri na itolu, iri ise na abụọ (1952). Ha na-eme ngagharị-iwe ka gọọmenti pakịstan mgbe ahụ họrọ asụsụ ha bụ bengali dịka asụsụ-ala nke abụọ ha [bekee]The date represents the day in 1952 when students demonstrating for recognition of their language, Bengali, as one of the two national languages of the then Pakistan, were shot and killed by police in Dhaka,which is the capital of present day Bangladesh. Wikipedia.. Kaosinadị, taa ha bụzi ndị bangladesh ma werekwa bengali dịka asụsụ-ala bangladesh.

Ndị Igbo, chetanụ na onye kpọọ ite ya mkpọkọrọ ite, onye iro ewere ya kpoo ntụ ụtụtụ. A na-ekwu na asụsụ Igbo na-achọ ịda mmiri ọ na-efe anyị efe na ntị. Unu ahụkwara (kamgbe 1952) mgbe ndị agbụrụ ọzọ jiri malite zọwa asụsụ ha (olundi), maka na ọ bụ dike na-azọ ala, ala a na-azọ dike. Ka anyị buru n’obi na onye asụsụ ya fulahịrị, na omenala ya efukwuola maka na a naghị aghara isi ga gwụọrọ otele ájụ́. Anyị bụ Igbo hapụ asụsụ e jiri mara agbụrụ anyị, maranụ na ọdịnaala ndị Igbo efutọpụla nke o fufọrọ.
Ajụjụ anyị wee bụrụ ma ọ bụ nwa mgbeke na-amaghị akpụ isi ka ọ bụ na-agụba ya adịghị nkọ n’ihi na ewi sị na ya amaghị atụ ala bụ aghụghọ. Bikonụ, ka anyị nyere ụmụ anyị aka mee ka ha soro anyị mara ụtọasụsụ Igbo. Agbụrụ anyị bụ Igbo zuru ime ka asụsụ anyị bụ Igbo kwụrụkwa chịmchịm, maka na miri nwere awọ nwee mbara e nwezuola ihe na-ekwere ya egwu.
Jenesis 11:9 “Ọ bụ ya mere e jiri kpọọ ya Bebel, n’ihi na n’ebe ahụ ka Jihova ghagburu asụsụ ụwa niile; ma site ebe ahụ ka Jihova mekwara ha gbasasịa ebe niile n’elu ụwa [bekee]Genesis 11:9 Therefore its name was called Babel, because there the Lord confused the language of all the earth; and from there the Lord scattered them abroad over the face of all the earth. RSV.”

Soro anyị kwube na nke anyị agaghị efu, Igbo ga-adị!

Nkàtá yirinu

Oyiri

Soro gbasaa ozi

Hapụ Ozi